Jump to content

Atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation/2025-2026

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2025-2026 and the translation is 98% complete.
Outdated translations are marked like this.

Na nsote afọ ntuliaka na 2024 nke pụtara ihe na akụkọ ihe mere eme, mgbe ọtụtụ mmadụ tozuru oke ịtụ vootu karịa mgbe gara aga n'akụkọ ihe mere eme mmadụ, ụwa na 2025 na-enwe nnukwu mgbanwe nke ndọrọndrọ ọchịchị mpaghara, usoro iwu, amụma, na mgbanwe mmekọrịta ọha na eze nke na-ebutere Otu Wikimedia ihe ịma aka na ohere.

Na Jenụwarị 2026, Wikipedia ga-eru afọ Iri abụọ na ise. Ememe ncheta ọgbọ nke a ka a ga-eme n'etiti oge atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation na-esote. N'ile anya n'ihu, ọ na-enye ohere na-adịghị ahụkebe maka ntụgharị uche na ime ememe, yana ịkwalite mkpa nke atụmatụ doro anya ma dị irè iji chebe ma kwalite ihe ọmụma zuru ụwa ọnụ a pụrụ iche. N'ezie, ọrụ anyị na-akpọku anyị ka anyị mee nke a ruo mgbe ebighị ebi ruo ọgbọ ndị ga-abịa.

N'oge a, atụmatụ Wikimedia Foundation na-emetụta ụdịdị dị iche iche site na nzaghachi ngwa ngwa ruo na atụmatụ ọtụtụ ọgbọ nke ezubere iji bawanye ndị ọrụ afọ ofufo, ọdịnaya, ndị ọgụụ na ego. Anyị ga-enwe ike ịrụ ọrụ n'otu oge na obere oge, ọkara oge na ogologo oge.

Ọtụtụ ogo atụmatụ ndị a na-akwalite atụmatụ ntuziaka Njem Wikimedia iji jee ozi dị ka “ akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ihe ọmụma n'efu” ka anyị na-ele anya n'afọ 2030 ma gafee ya. Atụmatụ kwa afọ a na-ahụta ịdị mkpa nke nnọpụiche, ịbụ n'efu, ọdịnaya ensaịklopedik n'ime nnọharị nke mgbanwe ngwa ngwa nke ịntanetị na-agbanwe agbanwe. Ọ na-ajụ ka anyị ga-esi wusie ike ma chebe ụkpụrụ na ụsoro Wikimedia iji chebe ndị mmadụ na ọrụ ya. Ọ na-elekwasị anya ka anyị nwere ike isi jikọ ọnụ rute ndị ntinye aka ọhụrụ na ndị ji ọrụ anyị eme ihe ka ha na-aga n'ihu na-eme nke ọma ruo ọgbọ na-abịa.

N'ọnọdụ ahụ, atụmatụ na mmefu ego nke afọ a na-enye nkọwapụta nke ebumnuche maka afọ mmefu ego na-abịa (July 2025 - June 2026) yana nkọwapụta nkerisi otu esi etinye ego na ihe ndị na-ebute ụzọ. Ọ na-ewere ntụzịaka ya site na isi usoro na mkpa dị n'ụwa gbara anyị gburugburu, yana otu Wikimedia Foundation nwere ike isi meghachi omume na mmetụta.

Gịnị ka ụwa n'atụ anya n'aka anyị ugbu a?

N'ime ọtụtụ afọ gara aga, usoro atụmatụ amalitela na ajụjụ a dị mkpa na nke na-enye ntuziaka. Ọ na-akọwa gbasara nnyocha na nkọwa nnyocha banyere ọnọdụ mgbanwe n'ewu ewu n'ụwa na ọnọdụ ngalaba otu nke na-achkọba ọrụ anyị iji mezuo ebumnuche Wikimedia, n'ime mbanye afọ na n'ime mpụta afọ.

Ihe ịma aka na egwu ịkekọrịta ozi a kwadoro, nke na-anọpụ iche n'ịntanetị amụbaala nke ukwuu. Ntụkwasị obi ozi zuru ụwa ọnụ na n'ịntanetị na-ebelata, nkwekọrịta enwekọrịtara banyere ozi bụ eziokwu bụ nke na-ekewa. Iwu na ụkpụrụ ndị na-achọ ịchịkwa usoro teknụzụ n'ịntanetị anaghị enye ohere zuru ezu nye nhiwe ndị na-abụghị maka achụmnta ego dị ka Wikipedia.

Anyị na-ahụkwa mgbanwe ngwa ngwa nke ebe dijitalụ nke na-agụnye mmụba dị ukwuu nke ọnụọgụgụ ọdịnaya ejiri igwe mepụta n'ịntanetị. Ozi dị elu nke a pụrụ ịdabere mmadụ mepụtara aghọwo ihe na-ebelata na ihe dị oké ọnụ ahịa nke usoro nkà na ụzụ na-agba mbọ ikpochapụ site na weebụ ma mee nkesa site na ahụmahụ ọchụchọ ọhụrụ (ma AI na ọchụchọ omenala) na nhiwe ha. Ọrụ nke ọrụ Wikimedia aghọwo ihe dị mkpa na ọnọdụ a, n'agbanyeghị na anyị na-ahụ ọrụ anyị dị ka nke na-adịchaghị ahụ anya, ka ojiji ọdịnaya nke ndị ọzọ na-eto.

Na mgbakwunye, nkwado ogologo oge nke ngalaba otu Wikimedia na-adabere na nbata nke ndị ọrụ ọhụrụ na-enye aka na ọdịnaya dị mma ma nọgide na-arụ ọrụ. Anyị ga-anwale ụzọ anyị ga-esi nweta ọgbọ na-abịa nke editọ, wee gbasaa ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ afọ ofufo ntụkwasị obi (nke a na-akpọkwa ndị ọrụ nwere ikike agbatịri) ndị na-arụ ọrụ dị mkpa n'ịhụ na ịdị mma na ntụkwasị obi na ọrụ a bụ ihe echekwabara.

Ebumnuche na-aga n'ihu n'eme, nnwale nchepụta ọhụrụ

Ka anyị na-eche ihu n'ime usoro ndị a na ndị ọzọ zuru ụwa ọnụ, atụmatụ a na-enye nkọwapụta nke ihe ịgan'ihu n'eme na nchepụta ihe ọhụrụ. Ebumnobi ndị akọwara n'okpuru na-agbado ụkwụ na agamnihu ime atụmatụ ndị gara aga (lee 2024, 2023, 2022). Nkwado maka akụrụngwa teknụzụ na mmepe nrụpụta na-anọgide ka ihe ndị dị mkpa na akụrụngwa nke Foundation iji mee ka Wikipedia na ọrụ Wikimedia bụrụ ndị a pụrụ ịdabere na ya, nke echekwara, dị mfe mnweta, ma na mgbanwe iji gboo mkpa nke ndị ntinye aka na ndị ji ọrụ anyị eme ihe n'ebe niile.

Ebumnobi anyị kachasị elu ka ahazigharịrị ka ọ bụrụ atọ (Akụrụngwa, Nkwado ndị ọrụ afọ ofufo, na ịdị ire imepụta ihe achọrọ.) dị ka ụzọ dị mfe ma dị irè iji gosipụta ọrụ "mmekọrịta na teknụzụ" nke Wikimedia na nkwado ma teknụzụ na ndị mmadụ na-akwalite ọrụ a dị ka akụkụ dị mkpa nke Intanetị ojiji n'efu na nke mepere emepe.

  • Ebumnobi gbasara akụrụngwa: N'iganihu na afọ ndị gara aga, a na-ahazi ọrụ n'okpuru ebumnuche akụrụngwa n'ime:
    • Na-emeziwanye Mmụtara Wiki ka ndị ji ọrụ anyị eme ihe na ndị Ọgụụ chọọ ịlaghachi, itinye aka nke ukwuu, ma tinye aka n'ụzọ bara uru nye ha;
    • iji mee Nnwale ụzọ ọhụrụ iji ruo Ndị na-ege ntị n'ọdịniihu, gụnyere iweta ọdịnaya encysaịklopedik na oghere mmekọrịta dị n'ịntanetị ebe ọgbọ ọhụrụ nke ndị ntinye aka na ndị n'eji ọrụ anyị eme ihe na-etinye oge ha;
    • Itinye ego na Ọrụ Data iji kwalite ịdị ọsọ ọsọ nke nnwale na nrụpụta na-eji teknụzụ ọhụrụ ime ka ọ dị ngwa ngwa.
  • Ebumnobi nkwado ọrụ afọ ofufo: Ebumnuche nkwado ọrụ afọ ofufo na-achịkọta ọrụ nke ọtụtụ ndị otu na Foundation iji kwado ma chebe ndị na-enye aka na ọrụ Wikimedia na ọkwa niile, na usoro mmekọrịta dị mkpa maka ịmepụta ntinye aka ndị a. Ọ na-agbasa n'ebumnobi nnọgidesike nke afọ ndị gara aga, gụnyere ndị lekwasịrị anya na nchekwa na nha nhata ihe ọmụma, na ibute ụzọ:
    • ichebe ndị ọrụ afọ ofufo site na nkwado ntụkwasị obi na nkwado nchekwa na nkwalite akụrụngwa na ngwa iji chebe ndị mmadụ (dịka ọmụmaatụ, mmegbu nke ukwuu);
    • Ịkwado ọrụ anyị' iguzosi ike n'ezi ihe site na nchedo iwu, iwusi ụkpụrụ nnọpụiche, imegide ozi na-ezighi ezi na nke nke n'adabachaghị, na-eme ka enwe mmata nakwa ilebara oghere ihe ọmụma anya;
    • Na-eme ka Otu anyị dị ike site na ime ka njikọ dị oke egwu na mmekorita dị n'etiti ndị ọrụ afọ ofufo, ndị mmekọ na ndị ngalaba otu Otu a, na site na ntinye aka mpaghara na nke zuru ụwa ọnụ.
  • Ebumnuche ịdị irè: Ebumnobi ịdị irè na-elekwasị anya ma na-aga n'ihu na-ewusi ma na-emeziwanye ikike ego nke Foundation, njikwa ihe ize ndụ, nhazi, na ịrụ ọrụ iji rụọ ọrụ na nlekwasa ebumnuche ndị a na n'ebumnobi anyị. N'afọ a, ebumnobi ndị bụ isi gụnyere:
    • Itinye ego n'ọrụ ogologo oge atụmatụ nweta ego dị iche iche, gụnyere mmụta sitere na nnwale ahụmịhe ndị enyemaka ndị ọzọ;
    • Na-emewanye 'Usoro njikwa ihe ize ndụ , usoro gasị, na usoro agbakwunyere n'ime otu gburugburu foundation;
    • Ịkwado ego, ọrụ, na ihe ọmụma mmadụ njikwa arụmọrụ, na ịkwalite ngwá ọrụ na usoro maka ịrụ ọrụ anyị nke ọma na nke di ire.

Mee Nnwale site n'inweta mkpebi sitere n'ọtụtụ ebe nchịkwa na abụghị nke otụ ndị mere

N'akụkụ ebumnobi ndị a, atụmatụ afọ nke afọ a ga-agụnyekwa mmụta na ntugharị nke nnwale atọ nke ndị Board of Trustees kwadoro. Ebumnobi ndị a n'elekwasị anya iji nyochaa ka otu Wikimedia nwere ike isi nyefegharịa azm ajụjụ maka ihe na ime mkpebi nye ndị kansụl nnọchite anya na otu ndị afọ ofufo n'edu n'ọtụtụ ebe ọrụ:

  • Product and Technology Advisory Council (PTAC): Otu a na-eweta ndị nkwado teknụzụ, ndị nnọchite anya otu mmekọ, na Wikimedia Foundation ọnụ ijikọwapụta usoro teknụzụ na-agbanwe agbanwe, nke ga-eme n'ọdịnihu. A mara ọkwa ndị otu kansụl a na Ọktoba 2024, ma ha zutere n'onwe na Jenụwarị 2025 ka ha bipụta recomendation nke mbụ ha.
  • Global Resource Distribution Committee (GDRC): Nchịkọba a ga-eguzobe òtù zuru ụwa ọnụ nke ndị ọrụ afọ ofufo ga-ewepụta atụmatụ na iwu maka otu esi ekesa onyinye na akụrụngwa na gburugburu Wikimedia, na-elekọta Kọmitii ego mpaghara, ma nye ndụmọdụ metụtara ọrụ nke Community Fund nye Wikimedia Foundation. A ga-emebe otu GRDC nwa oge na Wikimania 2025 dị ka nnwale mmụta afọ abụọ, nke a ga-enyocha ya tupu ọ malite ịrụ ọrụ nke ọma.
  • Atụmatụ emelitere maka ịkwado otu Njem a: Nnwale a, iji kwekọọ n'ụzọ chiri anya na ụzọ nke usoro nkesa ihe, gbadoro ụkwụ na gburugburu nke ngalaba òtù gasị , gụnyere ndị mmekọ nọ ugbu a na ụlọ ọrụ ndị a tụrụ aro dị ka Họbs. O lekwasịla anya n'usoro nchikọta eziokwu ya na ndị isi, gụnyere Kọmiti Mmekọrịta na Ndị isi njikwa otu mmekọ, iji mapụta otu si dị ma enwere ike ịhazi ya maka mkpa n'ọdịnihu.

N'oge na-adịbeghị anya, Wikimedia Foundation sokwa ndị Board of Trustees rụkọọ ọrụ, yana site na ọrụ ogbako ngalaba otu, ịtụpụta atụmatụ agbam ume Wikipedia Neutral point of view n'oge achọrọ ha karịa mgbe ọ bụla. Anyị na-atụ anya na mbọ ndị a ga-aga n'ihu n'ime afọ mmefu ego nke atụmatụ afọ a achịkọba.

Na-ebute ntinye ego anyị ụzọ karịa

Ọnọdụ ego nke Wikimedia bụ isiokwu bụ isi maka nhazi atụmatụ ọtụtụ afọ nke metụtara ihe ndị ga-ebute ụzọ na nnakọta ego, njikwa ego, na ntinye aka n'ịzụlite ụzọ esi enweta ego dị iche iche iji chebe na itolite ozi a ruo ọgbọ na-abịa.

Nkọwa dị ugbu a na-egosi mmụba ego ha nwetara ihe dị ka +6% na 2025-2026, yana +/-5% maka afọ abụọ na-esote.E jiri ya Tụnyere afọ ndị gara aga, ọkwa uto a dị mma chọrọ ka a na-elekwasị anya na ihe ndị kacha mkpa ma nye ezi mgbanweta na mpaghara ndị bụ isi nke itinye ego, ma na-abawanyekwa nkwudosike anyị.

Na nzaghachi, mmefu ego nke afọ a na-egosipụta ntinye aka na atụmatụ ego dị mma nke na-akwado ebumnuche site ugbua ruo ọtụtụ ọgbọ. Ihe enyemaka anyị ga-abụrịrị nke na-elekwasị anya n'ọdịnihu iji kwalite ozi nlegara anya anyị, ma dị mfe mgbanwe iji zaghachi mkpa dị ngwa ngwa. Dị ka ọ dị n'afọ ndị na-adịbeghị anya, akụrụngwa ka bụ akụkụ kachasị ukwuu nke mmefu ego, anyị ga-aga n'ihu na-ebute ụzọ uto ego nke Njem a.

N'otu aka ahụ n'afọ gara aga, ọrụ metụtara teknụzụ na-anọchi anya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke mmefu ego Foundation nke 47% n'akụkụ ihe ndị dị mkpa iji chebe ndị ọrụ afọ ofufo na ịgbachitere ọrụ nke 29% ọzọ - mkpokọta 76% nke mmefu ego nke Foundation kwa afọ. Mmefu maka ego, njikwa ihe ize ndụ, ịnakọta ego, na arụmọrụ bụ 24% fọdụrụnụ.

A na-edobe isi ego eji arụ ọrụ ndowe n'ụzọ dabara na omume kacha mma nke otu akwụ ụgwọ maka nkwudosike, yana mgbanwe ịzaghachi mgbanwe ndị a na-atụghị anya ya ma ọ bụ nke a na-atụghị anya ya na ụtụ isi, usoro iwu, ma ọ bụ gburugburu amụma. N'ime atụmatụ kwa afọ a, enwere ike iji 1% nke ego ndowe kwado mmemme ncheta afọ iri abụọ na ise nke Wikipedia dị ka mmemme dị ike, nke otu oge, na nke na-agaghị emegharị ọzọ.

N'ikpeazụ, ego a na-enye ndị ọrụ afọ ofufo na ụlọ ọrụ Otu a ga-abawanye site na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ percentị iri na otu n'afọ na-abịa, n'ikwekọ na ọnụego uto nke ntọala ahụ. Nke a na-akwado ihe karịrị onyinye Nar anọ ndị ọrụ afọ ofufo, ndị mmekọ, na ndị mmekọ nke Njem a. N'ikwekọ na ụkpụrụ ọtụtụ afọ, ego a ga-abawanye site na 5% ọzọ kwa afọ na FY26-27 na FY27-28 iji kwado atụmatụ ogologo oge ga-adigide karị. Ọ na-enyekwa ohere enyemaka mpaghara ka o nye aka maka iri eleu nkeihe ma na-enye mmụba dị ntakịrị na nkwado onyinye n'ozuzu ya.

Otu a ga-esi mụtakwuo

Ị nwere ike chọta ozi ndị ọzọ ebe a gbasara otu esi esonye na atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation.

Na mgbakwunye, Foundation na-ezipụ akwụkwọ akụkọ kwa izu abụọ na agamnihu gbasara atụmatụ Kwa Afọ. Ị nwekwara ike ịgụ ihe achịkọbara na ọnwa isii ebe a maka agamnihu emere megide atụmatụ afọ gara aga.

Nkokọ na akụrụngwa