Jump to content

Atụmatụ kwa afọ nke Wikimedia Foundation/2025-2026/Ebumnobi/Nkwado Ọrụ afọ ofufo

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2025-2026/Goals/Volunteer Support and the translation is 100% complete.

Ebumnobi nkwado ọrụ afọ ofufo na-elekwasị anya n'ọrụ Foundation na:

  1. ịchekwaba ndị ọrụ afọ ofufo ka ha nwee Ike itinye aka ná nchịkọba nke ihe ọmụma niile n'enweghi ihe ịma aka
  2. Kwado Ọrụ Wikimedia iji kwalite mmetụta ha na ụwa, na
  3. Mee ka Nhiwe anyị sie ike, tinyere ndị ọrụ afọ ofufo, ndị otu mmekọ, ndị njikọ aka nhiwe, na ndị ọzọ site na njikọ, akụrụngwa, na ọchịchị dị irè maka mmetụta, nkwudosike na nkwusike na mgbanwe .

Ebumnobi a ga-azaghachi karịsịa na ihe ndị a:

  • Nnọpụiche - Anyị na-ahụ ihe egwu dị elu gbasara ntinye aka na ihe ọmụma efu n'ịntanetị, site na iri elu isiokwu ndị na-ese okwu ka ọ bụrụ nke nwere akparamagwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nkewa n'akụkụ echiche dị ka "eziokwu" na "Ọnọdụ nke anaghị akwado akụkụ ọ bụla," na iyi egwu ogologo oge nye nkwupụta uche onwe.
  • Ndị ọrụ nwere ikike karịa - N'ihi ya, ụdị ọrụ Wikimedia nke ochịch ngalaba otu na-aga nke ọma na-etinye ụfọdụ ndị ọrụ afọ ofufo - ọkachasị ndị nwere "ikike karịa" dị ka ndị nchịkwa na ndị otu ArbCom - n'ihu ọrụ ịkwado ọrụ Wikimedia ọbụladị n'ọdodụ iyi egwu na-abawanye. Ndị ọrụ a bụkwa isi ndị ga enyere aka mee ka ọrụ anyị ghọọ nke ọtụtụ ọgbọ, nakwa isi nlekwasị anya nke ebumnobi a.
  • Ndị ntinye aka - enwere ịrị elu dị mkpa iji hụ na ntinye áká na mmụtaara nwere uru ma n'adọrọ mmasị, ma nwee nkwado nsonye na njikọ.

ihe mgbanwe ndị a n'ewu ewu na-eme ka ọrụ nke ịkwado ndị ọrụ afọ ofufo, ndị na-enye aka na ndị mmekọ dị mkpa karịa mgbe ka ọ dịbuuru. Anyị chọrọ ka ndị ọrụ afọ ofufo hapụ ịnwe ihe n'eyi há egwu, ka ha jikọọ, ma nweta ikike inye aka na ọrụ ndị ahụ. Anyị chọrọ ka ndị ọgụụ na gburugburu ụwa nwee ike ịnweta ọrụ ndị ahụ n'ụzọ dị mfe, bụrụ n'efu, na n'enweghị nsogbu. Anyị chọrọ ka ndị ihe anyị na-amasị si n'ọtụtụ ngalaba, ala, na echiche ghọta ọrụ Wikimedia ka ha wee nwee ike inye aka chebe ma kwalite ha.

Chekwaba Ndị ọrụ afọ ofufo

1.1 Ntụkwasị obi na nchekwa: Anyị ga-echebe ndị ọrụ afọ ofufo pụọ na uto nke egwu

Ọchịchị nchịkọta ọha mmadụ nke Wikimedia bụ isi usoro emebere maka ntụkwasị obi na nchekwa n'ọrụ anyị, ebe ndị ọrụ afọ ofufo na-etinye aka n'ichepụta na ịmanye atumatu ọchịchị nke gosipụtara ụkpụrụ nke ọrụ Wikimedia. Ọrụ anyị bụ ịkwado ọrụ nke ngalaba otu ndị a iji chekwaa ndị mmadụ na ịkwado iguzosi ike n'ezi ihe nke ọdịnaya, ma ịkwado ebe nchekwa dị mma maka ikesa, ịnata, na-izupu ozi na ọrụ Wikimedia n'ụzọ ziri ezi. Ọmụmaatụ nke ọrụ a gụnyere:

  • inye ọzụzụ na ihe ndị ọzọ maka kọmitii mmanye mgbaso ime ihe (Ombuds Commission, ArbComs, Stewards, U4C, na ndị ọzọ),
  • Njikọ aka nke anyị na ndị ngalaba ọtụ a gasị na ọrụ Wikimedia iji melite nkwenye ha na Universal code of Conduct.
  • mbipụta akwụkwọ metụtara nchekwa Ngalaba Otu,
  • iwulite mmekọrịta anyị na ndị enyemaka nchekwa dijitalụ na òtù ndị ọzọ lekwasịrị anya na nchedo nke mgbasa ozi na ndị ọrụ obodo.
  • Iji ndị otu njikọaka mbụ malite mmemme nnyocha ịdịmma nke Digitalụ.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Mee ka mmata banyere mgbanwe mba ụwa nke nchegbu iwu n'etiti ndị ọrụ nwere ikike karịa
  • kwalite mmanye mmezu na mwulite ikike maka nchekwa na adịmma nke ngalaba otu n'ime otu Wikimedia
  • Mee ka nkwurịta okwu banyere ihe ize ndụ maka nchekwa ngalaba otu sie ike
  • Mee ka nkwado dịkwuo mma nye ndị ọrụ na-akọ akụkọ nsogbu site na emergency(_AT_), humanrights(_AT_), na ca(_AT_)
  • Increase protection for volunteers facing threats due to their good faith contributions to the projects.

1.2 Mbawanye mkparị: Anyị ga-echekwa ndị ngalaba otu na usoro site na mmetọ dị ukwuu site na imeziwanye akụrụngwa, ngwa na usoro anyị

Ndị mmadụ na nhiwe na-eche ihu na egwu na-arịwanye elu gburugburu ụwa mgbe ha na ekesa ozi a pụrụ ịdabere na ya, nke na-enweghị ihu abụọ. Nke a na-eme ka ọ dị mkpa iji mee ka mgbochi na ikike mbelata mkpagbu anyị sie ike, chebekwa ọrụ anyị megide ihe egwu fesara ebe niile na nke atụrụ aka mee, ma mee ka nzuzo na nchekwa nke ndị ọrụ anyị sie ike.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Gbaa mbọ hụ na usoro akụkọ ihe mere a na-achọpụta n'ụzọ dị mfe, bụ nke etinyere na ọrụ anyị niile
  • Melite izi ezi na ịdị irè nke ngwá ọrụ mgbochi mkpagbu, zibata nkwalite na ikike ọhụrụ na ọrụ mgbochi mmebi
  • Belata ọnụ ọgụgụ nke nnukwu mwakpo nke chọrọ SRE ntinye aka mmadụ site na 50% karịa afọ gara aga.
  • zinye Akaụntụ nwa oge n'ọrụ Wikimedia niile, ka mkpughe ozi nke onwe maka ndị ndezi edebanyeghị aha dị ihe na-erughị 0.1% nke ndị ọrụ debanyere aha.
  • mee ma bipụta ihe ize ndụ AI na nnyocha ohere maka Ntụkwasịobi na Nchekwa, na-achọpụta ihe iyi egwu na ohere ndị nwere ike ime, yana atụmatụ mgbochi ma ọ bụ nkuchi nye ọrụ Wikimedia.

Kwado ọrụ anyị

2.1 Nchekwa Iwu: Anyị ga-echebe ọrụ ndị a site na iyi egwu iwu

Dị ka ndị njikwa nke ọrụ Wikimedia, Wikimedia Foundation na-anabata arịrịọ iwu maka ịgbachitere ntinye aka afọ ofufo na tinye aka na ịgba akwụkwọ ebe ọ dị mkpa iji chebe ụkpụrụ na ọrụ anyị karịsịa. Nyere ọnọdụ anyị zuru ụwa ọnụ, nke a gụnyere ịtụle ọtụtụ ihe metụtara itinye iwu maka nchekwa na nnabata. Ndị a na-agụnye ihe iwu dị na ya, ndị ọrụ na ndị ntinye aka o nwere ike imetụta, yana mmetụta nwere ike ime na ihe omume ndị ọzọ bụ akụkụ nke ebumnuche zuru ụwa ọnụ anyị. Ọ bụ ezie na Foundation ka bụ ọgbakọ anaghị akwụ ụgwọ na United States, atụmatụ anyị agbatịala ogologo oge karịa ebe etinyere foundation n'ụzọ iwu ma hụta ya dịka ebe Wikimedia na-arụ ọrụ iji mezuo ebumnuche ahụ ma nye ohere inweta ihe ọmụma n'efu.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • mgbachitere ọrụ megide ikpe ndị na-anwa iwepu ọdịnaya ma ọ bụ ụdị ikpe ọjọọ ndị ọzọ
  • Ịgba mbọ hụ na Iwu Nzuzo anyị bụ ihe emelitere maka atụmatụ ndị ga-eme n'ọdịnihu, na-egosipụta mgbanwe iwu chọrọ, ma ọ dịkwa mfe ndị ọrụ ịghọta
  • Chekwaa Wikimedia pụọ n'aka ndị ọjọọ na-anwa iji akara ngosi na akara Wikimedia mee ka ha abụ ndị Wikmedia, rịọ maka azụmahịa aghụghọ, ma ọ bụ na-ebutere ọha na eze mgbagwoju anya
  • Mebee mmeme mmetụta usoro ikpe anyị iji chekwa ọrụ Wikimedia, ndị na-enye aka, ma rụọ ọrụ na ntuziaka mgbanwe nke gburugburu anyị na-agbanwe agbanwe
  • Gbaa mbọ hụ na ndị na-ege ntị n'ụwa niile nwere ike ịnweta ọrụ ndị ahụ n'enweghị nsogbu nakwa n'ụzọ dị mfe

2.2 Nkwenye: Anyị ga-ahụ na ọrụ Wikimedia dabara na usoro nhiwe kwesịrị ekwesị

Iji hụ na ọrụ anyị dị mfe mnweta, anyị kwesịrị ịhụ na ọrụ Wikimedia kwenye n'ụkpụrụ iwu na-achị nhiwe intanetị ma kwado ntinye uchu ndị dị na Amụma ikike mmadụ. Ọmụmatụ gụnyere ihe ndị a chọrọ kwa afọ n'okpuru EU Digital Service Act na ibipụta global transparency report ugboro abụọ n'afọ.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

2.3 Iguzosi ike n'ezi ihe ọmụma: Anyị ga-akwado ndị ọrụ afọ ofufo iji wusie nguzosi ike n'ezi ihe ọmụma na ọrụ anyị

Nkwekọrịta ọha na eze nwekọrọ gbasara ozi a na-ewere dị ka eziokwu na nke nwere ntụkwasị obi na-ekewa, na-ebute mkpagbu nye ozi enweghi akukụ ọ kwadoro na ozi apụrụ inyocha. Nke a na-eme ndị ọrụ afọ ofufo nkwado ịkwalite nguzosi ike n'ezi ihe ozi na ọrụ anyị ihe kacha mkpa. Ọmụmaatụ gụnyere inye ọzụzụ na akụrụngwa, iwulite mmekọrịta chiri anya nke ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ a na mmemme ngalaba otu na mkparịtaụka, na imelite Otu nnọchianya na-emegide ozi n'ezighi ezi, mkpokọta akụrụngwa sitere na n'ofe Wikimedia gbasara otu ọrụ Wikimedia si arụ ọrụ na mbọ iji wusie isi ụkpụrụ ya ike dị ka ebe nweta ozi ndị a pụrụ ịdabere na ya na nke apụrụ inyocha.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Imeziwanye ikike nke ngalaba otu Wikipedia iji gbochie ozi nduhie na ọrụ anyị
  • Imeziwanye ikike nke Wikimedia Foundation ịchọpụta na imegide ihe ịma aka nke nguzosi ike n'ezi ihe ozi, gụnyere ozi nduhie na Wikipedia na Foundation, site n'imeziwanye nghọta nke ọrụ Wikimedia
  • N'ịhụ na ndị mgbasa ozi, ndị na-eme iwu, ndị na'emetụta iwu, na ụlọ ọrụ nwere ezi nghọta gbasara Wikipedia nke ọma dị ka ebe a tụkwasịrị obi apụrụ ịdabere nke ozi apụkwara inyochaa nye AI ma hụta ya ka ebe dijitalụ dị mma nye ọha na eze
  • Imeziwanye nkwado maka iguzosi ike n'ezi ihe na kọmitii mmanye mmezu, na nlekwasị anya na ndị ọrụ nwere ikike karịa
  • Ịkwado Wikipedia n'idobe ụkpụrụ zuru ụwa ọnụ na-ga-adigide ma dị irè nke metụtara iwu Neutral Point of View (NPOV).

=== 2.4 ilebanya n'oghere ihe ọmụma: Anyị ga-akwado ndị ngalaba otu anyị iji leba anya na oghere ọmụma na ọrụ anyị ===n

Ịmepụta ọdịnaya ensialopedik a pụrụ ịdabere na ya n'ihe karịrị asụsụ narị atọ bụ nnukwu ọrụ. Ọrụ anyị bụ ịkwado ndngalaba dịgasị n'otu anyị, site n'inye atụmatụ echiche, ngwaọrụ, nnyocha na nhazi iji mepụta ihe kachasị mma site n'oge na ike nke ndị ọrụ afọ ofufo.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Nyere ndị ngalaba otu aka ibute ụzọ na mwepụta obosara na omimi isiokwu achọrọ maka ọrụ asụsụ Wikipedia nwere ike iji mee ihe, na mgbada ụkwụ nke ịmam ịma, ịdị mkpa, ogo ọgụgụ enwereike izube na njikọ dị n'etiti akụkọ.
  • kwalite atụmatụ nrụpụta mmetụta dị elu dị ka ọrụ ndị a tụpụtara, ọchụchọ mgbasa ozi, na ntụgharị ọdịnaya; mee ka nhọrọ enyemaka ọhụrụ dị mfe tinyere ịmalite na ịzụlite ndị obere asụsụ Wikipedia.
  • Kwado ndị nhazi Wikimedia bụ ndị na-akpọkọta, na-azụ, ma na-akwado ndị nnyere aka ịrụ ọrụ na ebumnuche ọdịnaya jikọtara ha site na nhazi mmekọrịta dị ka WikiProjects na mkpọsa.
  • Nwee mmekọrịta nke ndị na-ebipụta akwụkwọ kachasị mkpa iji wepụ ihe mgbochi ebe isi mnweta ihe site na Wikipedia Library.
  • Gbaa mbọ hụ na ntinye aka anyị nwere mmetụta dị mma na ihe ọmụma dị mkpa site n'ịtụle mmụba nke ọdịnaya ndị ngalaba otu họọrọ karịchaa na ịdị mma, gụnyekwara ogo nzihachigharị na ọnụnọ nke ebemsidee na ihe oyiyi.

2.5 Nkwado amụma: Anyị ga-akwado amụma ịntanetị na-akwalite ihe ọmụma efu =

Anyị ga-achọ ime ka gburugburu iwu na nke nchịkwa dịkwuo mma nye ntinye aka dị nchebe na nke nsonye. Nke a na-agụnye ịkụziri ndị na-eme iwu na ndị isi nsonye na-emetụta ha (mgbasa ozi, ndị ọkà mmụta, na ndị otu ọha na eze) banyere otu kpụrụ Wikimedia si arụ ọrụ, yana otu ọrụ ndị ahụ si enye aka nye ọha mmadụ.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Zụlite mmata na ntụkwasị obi n'etiti ọha na eze, ndị otu amụma na ndị azụmaahịa iji nyere aka kwalite mmasị anyị
  • Gbaa mbọ hụ na ndị na-ahụ maka iwu ghọtara otú iwu nwere ike isi mebie ma ọ bụ chebe Wikipedia, ma nye nduzi tupu ha atụọ aro ma ọ bụ tinye iwu n'ọrụ n'ọdịnihu
  • Na-akwado ndị ọrụ afọ ofufo na ndị otu mmekọ ka ha duo nkwado iwu ọha na eze na ogige ma ọ bụ mpaghara ha.

Mee ka Otu a dị ike

3.1 Ijikọ Otu a: Anyị ga-emepụta nsonye na njikọ na gburugburu mpaghara

Enwere ọṅụ so ya n'ịbụru onye otu Njem a, ma mmetụta nsonye bụ ihe na-eme ka ọṅụ a dị ndụ. Anyị ga-emepe ma mee ka njikọ ndị a dị n'ụwa niile na n'ofe mpaghara iji mepụta ahụmịhe enweghị nsogbu nke na-atọ ụtọ ịrụkọ ọrụ ọnụ.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Kwado njikọ mpaghara site na ebe ndị agbakwunyere dị ka Afrika Baraza, WikiCauserie, CEE Catch Up, Special:MyLanguage/South Asia Open Community CallʼSouth Asia Open Community Call, MENA Connect na ndị ọzọ.
  • Tinye aka na ihe omume nke otu a dị ka Dịff, tinye ego karịa na ngosịpụta na Meta Wiki, wee mee ka ọ dịkwuo mfe ịgbaso ọrụ foundationna otu ebe site na Bulletin Foundation.
  • Hazie ọgbakọ njikọ aka na nkekọrịta ihe na ihe omume dịka Wikimania, Wikimedia Hackathon, na nzukọ mpaghara na nke otu ehiwere n'ihi isiokwu.
  • Mee ka ntinye áká ọbụla sonye site na WikiCelebrate, Wikimedian nke afọ na ihe ndị ọzọ.
  • Mee mmemme dị iche iche nke Wikipedia ndị na-agba afọ mmalite iri abụọ na ise - nke bụ ohere dị mkpa iji mee mmemme Wikipedia dị ka ebe ndabere nke ozi a pụrụ ịdabere na ya na ịntanetị. Mepụta mgbasa ozi mkposa zuru ụwa ọnụ na-adịgide adịgide nke na-eme ka Wikipedia pụta ìhè ma dị mkpa nye ọtụtụ ijeri ndị ọrụ ịntanetị.

Otu ihe a na-elekwasị anya n'ọrụ a niile ga-abụ ịkwado ndị ọrụ nwere ikike karịa.

3.2 Oninye Ego ọrụ na Nkenye akụrụngwa

Ndị Otu mmekọ Wikimedia, mkpọsa ọdịnaya, ndị na-enye aka na teknụzụ, ndị njikọ aka, na usoro mmekorita bụ ihe dị mkpa nke nhazi nke Otu anyị.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Ịga n'ihu na-emeziwanye ma na-edozi nchịkwa onyinye ego, na mmetụta nkọwapụta, na usoro ime mkpebi zuru ọnụ; mee ka ọtụtụ ụlọ ọrụ nwee ike ịmepụta atụmatụ ọtụtụ afọ dabara na nkwado, nchekwa, na usoro teknụzụ nke foundation. (ọzọEnwere ike ịchọta ozi ndị gbasara ego inyeaka anyị ebe a).
  • Na-arụ ọrụ n'ofe mpaghara iji kwado mmekọrịta pụrụ iche iji mechie oghere ọdịnaya, melite ikike ọgbaka, ma mepee ihe enyemaka ndị ọzọ.
  • Na-akwado ma na-agbanwe usoro okike nke ogbakọ nke Otu tụnyere ịkwado hubs iji hob mee nwale.
  • Gaa n'ihu iji mkpebi emere site n'ọtụtụ ebe ichị isi mee nnwale na gburugburu nkesa akụrụngwa dabara n'ụkpụrụ atụmatụ otu nke Subsidiarity & Self-Management, site na atumatu dịka Otu nkesa ihe enyemaka ụwa niile.

Ọchịchị na Ime mkpebi

A na-eme ka ọrụ dị irè n'ofe òtù a nwee ike site na ibu ọrụ doro anya na ikike ime mkpebi n'oge.

Ebumnobi ndị akọwapụtara gụnyere:

  • Ịga n'ihu iso ndị isi arụkọ ọrụ na Ọgbakọ otu a gasị Organizations na Global Resource Distribution pilot; zaa ajụjụ ndị dị mkpa re: nkesa ego maka òtù ndị ehiwegasịrị na otu a, na mgbanwe ndị a ga-etinye n'ọrụ n'afọ mmefu ego na-esonụ (FY26-27).
  • Kwado kọmitii ndị isi ọchịchị, gụnyere Board of Trustees nke Foundation, Affiliations Committee, na Elections Committee.

Nkokọ na ngwa