Training modules/dashboard/slides/10304-neutral-point-of-view/ig
Pillar nke Abụọ
"'Wikipedia nwere echiche nke eleghị mmadụ anyan'ihu pụrụ iche. "'
Ederede Wikipedia kwesịrị idekọ ma kọwaa isi echiche n'ụzọ ziri ezi na nke na-adịghị ele mmadụ anya n'ihu. Naanị eziokwu! Ekwela:
- Arụmụka ma ọ bụ mgbalịa ime ka ndị na-agụ ya kwenye
- Kesaa ahụmịhe nke onwe ma ọ bụ echiche
- Kesaa nyocha nke gị banyere ozi ị na-ahụ
N'ezie, ọ bụghị mgbe niile ka eziokwu na-edo anya. Ụfọdụ ederede nwere ike ịkọwa ọtụtụ echiche. N'ọnọdụ ndị dị otu a, gosipụta echiche ọ bụla n'ụzọ ziri ezi, na ihe gbara ya gburugburu. Atụghị aro na otu ụdị akụkọ ahụ bụ "eziokwu" ma ọ bụ "nke kachasị mma".
"'Nke a bụ nnukwu ihe. "'Ihe ọ bụla ị na-agbakwunye na isiokwu kwesịrị ịdabere na isi iyi nke ozi e bipụtara, ị ga-ekwukwa mgbe niile ozi ahụ mgbe ị gụnyere ya. (Echegbula onwe gị - anyị ga-egosi gị otú o si mee mgbe e mesịrị). Nke ahụ pụtara ịkọwapụta akwụkwọ ndị e bipụtara, ndị nwere ikike nke ndị mmadụ tụkwasịrị obi.