Usoro Mgbaso ime njem/Atụmatụ/Akụrụngwa nke n'akwalite ǹkà
You can read this page in your own language on the Movement Strategy Forum. |
Akụrụngwa nke n'akwalite ǹkà
Ọbụrụ n'anyị chọrọ itinye ego na úchú n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú, anyị ga-etinye ego karịa n'akụngwa teknụzụ nke n'akwalite ǹkà . Nke a nwere ike ịbụ site n'idozigharị ọ̀gbọ́ nkwalite ǹkà ndị dị adị maọbu rọpụta ndị ọhụrụ. Ọ̀gbọ́ nkwalite ǹkà a ga-enye ndị ji ya arụ ọrụ ohere ijikọta aka ọnụ kepụta ihe ndị eji amụ ihe n'asụsụ na ụdịdị dị iche iche, ka ọ dịkwa mfe ịchọpụta ihe ma wéré ihe achọpụtara rụọ ọrụ nakwa inwetanwu ụdịdị ihe ndị eji amụ ihe dị iche iche (dịka ihe ndị edere ede, ihe nkiri na ihe ndị ọzọ). Ọ̀gbọ́ mmụta a ga-enwekwa ihe ndị eji amụ ihe maka ndị n'abụghị ndị òtù Wikimedia Movement nakwa ndị batara ọhụrụ na ya, nke ga-eme ka aghara imefu ọtụtụ ego maọbu igbu ọtụtụ oge ịkụziri ha ihe a na-eme. Ọ̀gbọ́ mmụta a na ihe ndị eji amụ ihe ndịnaya kwesịrị ịdị mfe ịchọpụta ihe na ya site n'isi ruo na ọdụ, na-adịgidekwa, dịka Ụkpụrụ Mgbaso Movement Strategy niile si dị
Enwere ọ̀gbọ́ mmụta kaelee nke dị ugbua a na-akpọ WikiLearn, nke metụtara atụmatụ a n'ụ̀mị̀ nke ọma
Tinye ego n'akụrụngwa teknụzụ ndị dị adị maọbu rọpụta ndị ọhụrụ nke ga-eme ka amụta ǹkà site n'iji ngwaọrụ na-arụsi ọrụ ike kwesịrị oge a, nakwa inweta ndịnaya tara ọ̀chịchị́. Nkea kwesịrị na a ga-enwe:
- ọ̀gbọ́ mmụta nke n'agaghị enye nsogbu iji rụọ ọrụ, nke ichọ ihe na ya ga-adi mfe, dị n'ọtụtụ asụsụ ya na n'ụdịdị dị iche iche, nke ga-arụ ọrụ ka ọ́bá ebe a ga na-ahụ ihe ndị eji amụ ihe dị iche iche (ọmụmaatụ: ihe ngere, ihe nkiri, ọzụzụ esị n'ikuku ịntanetị enweta, dgz).
- Ihe ndị eji amụ ihe dị iche iche (dika "ńgwùgwù nke ihe mmụta juru na ya") nke a ga na-enye ndị mmadụ na ndị si n'òtù ndị ọzọ bátá n'òtù Movement Strategy a, nke ga-akwado inweta amamihe nke onweonye, nakwa ịwụlitekwu ǹkà n'omume na ọrụ anyị dị iche iche ekenyere anyị.
- Ńgwùgwù ihe mmụta dị iche iche juru na ya, nke ekwesiri inwe, iji ghọta ókwú niile gbasara idigide adịgide ya, ịkpagharị n'ime ya site n'isi ruo na ala, nakwa akụkụ ndị ọzọ ndị ekwuru maka ha na Wikimedia Movement Strategy Recommendations
Participate
Discuss
Join or start a discussion on Meta or the "Tinye ego na úchú n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú" space of the Movement Strategy Forum.
Create
Apply for a Movement Strategy implementation grant to create a project that advances this initiative.
Get help
If you need help in getting involved, please don't hesitate to get in touch directly with members of the Movement Strategy and Governance Team. They are here to help!
You can write to the team in any of 19 languages (listed on the team's page), by writing an email to: strategy2030wikimediaorg
Ọrụ ndị a ga-arụpụta
Mkparịtaụkaga na ihe ndị edere ede ndị gbasara ya
Ụfọdụ n'ime mkparịtaụkaga ndị gáfèrè agafe, ihe ndị edere ede, na àgbà ochie niile nke usoro Mgbaso Movement Strategy ndị nwere ike ịkọwakwu atụmatụ a ọfụma: